12
1 Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya,  
ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.   
   
 
2 Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị,  
ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.   
   
 
3 Onye ajọ omume agaghị anọgide,  
ma apụghị ihopu onye ezi omume.   
   
 
4 Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,  
ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.   
   
 
5 Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi,  
ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.   
   
 
6 Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ,  
ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.   
   
 
7 Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi,  
ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.   
   
 
8 Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ,  
ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.   
   
 
9 Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu,  
karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.   
   
 
10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,  
ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.   
   
 
11 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,  
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.   
   
 
12 Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere,  
ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.   
   
 
13 A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya,  
ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.   
   
 
14 Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ,  
inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.   
   
 
15 Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi,  
ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.   
   
 
16 Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ,  
ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.   
   
 
17 Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu,  
ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.   
   
 
18 Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha,  
ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.   
   
 
19 Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi,  
ma okwu ụgha anaghị adịgide.   
   
 
20 Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ;  
ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.   
   
 
21 Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume,  
ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.   
   
 
22 Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị,  
ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.   
   
 
23 Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha,  
ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.   
   
 
24 Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị,  
ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.   
   
 
25 Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba,  
ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.   
   
 
26 Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya,  
ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.   
   
 
27 Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ,  
ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.   
   
 
28 Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ,  
nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.