11
1 Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị  
ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ.   
   
 
2 Nganga bịa, nlelị a na-eso ya,  
ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe.   
   
 
3 Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha;  
ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.   
   
 
4 Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe;  
ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.   
   
 
5 Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi,  
ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha.   
   
 
6 Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya;  
ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha.   
   
 
7 Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi,  
ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi.   
   
 
8 Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha,  
ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya.   
   
 
9 Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya.  
Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya.   
   
 
10 Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ,  
otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ.   
   
 
11 A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu,  
ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume.   
   
 
12 Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu;  
ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.   
   
 
13 Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,  
ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.   
   
 
14 Nʼihi enweghị ezi ndị ndu ka obodo ji ada,  
ma ọtụtụ ndị ezi ndụmọdụ na-eweta mmeri.   
   
 
15 Onye ọbụla na-ana onye ọbịa nʼakaebe ga-ata ahụhụ,  
ma onye jụrụ ịkwụ ụgwọ onye ọzọ ji, nọ na ntụkwasị obi.   
   
 
16 Nsọpụrụ na-adịrị nwanyị nwere obiọma,  
ma ndị na-adịghị eme ebere bụ naanị akụnụba ka ha na-enweta.   
   
 
17 Onye nwere obiọma baara onwe ya uru,  
ma onye nwere obi ọjọọ na-ewetara onwe ya nsogbu.   
   
 
18 Onye ajọ omume na-anata ụgwọ ọrụ aghụghọ,  
ma onye na-agha ezi omume dịka mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ kwesiri ekwesi.   
   
 
19 Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ;  
ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ.   
   
 
20 Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị  
ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.   
   
 
21 Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ,  
ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.   
   
 
22 Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche,  
dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.   
   
 
23 Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ,  
ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.   
   
 
24 Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa,  
ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.   
   
 
25 E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya;  
onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.   
   
 
26 Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ,  
ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke.   
   
 
27 Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma,  
ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.   
   
 
28 Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada,  
ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.   
   
 
29 Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe,  
onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.   
   
 
30 Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ,  
onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.   
   
 
31 Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a;  
a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.