13
1 Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya  
ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.   
   
 
2 Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ,  
ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.   
   
 
3 Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!  
Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.   
   
 
4 Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;  
ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.   
   
 
5 Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,  
ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu  
na-ewetara ya ihere na nkọcha.   
   
 
6 Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,  
ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.   
   
 
7 Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa.  
Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.   
   
 
8 Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya,  
ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.   
   
 
9 Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ,  
ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.   
   
 
10 Nganga na-eweta esemokwu,  
ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.   
   
 
11 Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;  
ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.   
   
 
12 Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,  
mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.   
   
 
13 Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya,  
ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.   
   
 
14 Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,  
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.   
   
 
15 Ezi nghọta na-eweta ihuọma,  
ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.   
   
 
16 Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ,  
ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.   
   
 
17 Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu,  
ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.   
   
 
18 Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere;  
ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.   
   
 
19 Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ,  
ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.   
   
 
20 Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe,  
nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.   
   
 
21 Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie,  
ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.   
   
 
22 Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ,  
ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.   
   
 
23 Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri,  
ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.   
   
 
24 Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;  
ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.   
   
 
25 Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya,  
ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.