7
1 “Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba?  
Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?   
2 Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada,  
maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,   
3 otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya,  
nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.   
4 Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’  
Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.   
5 Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ;  
anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.   
   
 
6 “Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa,  
ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.   
7 O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume;  
anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.   
8 Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ;  
unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.   
9 Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa,  
otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.   
10 E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ;  
ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.   
   
 
11 “Ya mere agaghị m emechi ọnụ;  
aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ.  
Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.   
12 A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri,  
nke mere i ji eche m nche?   
13 Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi,  
maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,   
14 nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu  
werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,   
15 ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ,  
karịa inwe ụdị ahụ m nke a.   
16 Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi.  
Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.   
   
 
17 “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe,  
i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,   
18 i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile,  
ma na-anwale ya mgbe mgbe?   
19 Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ,  
maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?   
20 Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị,  
gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme?  
Gịnị mere i ji elekwasị m anya?  
Abụrụla m ibu arọ nye gị?   
21 Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m,  
ma bupụ mmehie m?  
Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ.  
Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”