6
Okwu Job 
 
1 Mgbe ahụ, Job zara sị:   
2 “A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m  
ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ!   
3 Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri,  
nke mere okwu m ji ada ike ike.   
4 Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m;  
mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha;  
ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m.   
5 Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata,  
ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị?   
6 A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu,  
ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ?   
7 A jụrụ m ịmetụ ya aka,  
nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa.   
   
 
8 “O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,  
na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya.   
9 Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m  
ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m.   
10 Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a,  
wụlikwaa elu nʼime ihe mgbu na-adịgide,  
na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.   
   
 
11 “Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ?  
Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi?   
12 Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume?  
Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?   
13 Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka,  
ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube?   
   
 
14 “Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ  
na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ.   
15 Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha,  
dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya,   
16 nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi,  
nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi.   
17 Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị,  
nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ.   
18 Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha.  
Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi.   
19 Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri,  
otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya.   
20 Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi,  
ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.   
21 Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru,  
unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu.   
22 O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m,  
sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m,   
23 gbapụtanụ m nʼaka ndị iro,  
maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’?   
   
 
24 “Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ,  
gosi m ebe m si mejọọ.   
25 Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi!  
Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta?   
26 Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m?  
Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu?   
27 Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna,  
ma refukwaa enyi unu.   
   
 
28 “Lezie m anya nke ọma,  
ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha?   
29 Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi,  
tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike.   
30 Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta?  
Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?