8
Okwu Bildad 
 
1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:   
2 “Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a?  
Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.   
3 Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?  
Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?   
4 Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya,  
o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.   
5 Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike,  
rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,   
6 ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi,  
ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị  
weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.   
7 Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala,  
ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.   
   
 
8 “Jụọ ọgbọ ndị gara aga  
ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.   
9 Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara.  
Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.   
10 Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe?  
Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?   
11 Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị?  
Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?   
12 Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,  
ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.   
13 Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,  
otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.   
14 Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;  
ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.   
15 Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi;  
ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.   
16 Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,  
nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.   
17 Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,  
ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.   
18 Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,  
ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’   
19 Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,  
site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.   
   
 
20 “Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ,  
maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.   
21 Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị.  
Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.   
22 Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe,  
ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”