36
1 Elihu gara nʼihu sị:   
2 “Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị  
na ọ ka dị ọtụtụ ihe e nwere ikwu nyere Chineke.   
3 Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya;  
aga m enye Onye kere m ezi omume.   
4 Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha;  
onye zuruoke nʼihe ọmụma nọnyeere gị.   
   
 
5 “Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;  
ọ dị ike, bụrụkwa onye na-eme ihe ọbụla o zubere ime.   
6 Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,  
kama ọ na-enye ndị a na-akpagbu akpagbu ihe ruuru ha.   
7 Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ,  
kama ọ na-eme ka ha na ndị eze nọkwasị nʼocheeze,  
bụrụ ndị e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.   
8 Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,  
jirikwa agbụ nke mkpagbu jidesie ha ike,   
9 ọ na-agwa ha ihe ha mere,  
na ha sitere na nganga ha mehie.   
10 Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,  
na-enyekwa ha iwu ka ha chegharịa site nʼajọ ihe ha na-eme.   
11 Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,  
ha ga-abụ ndị ga-ebi oge ndụ ha fọdụrụ nʼakụnụba,  
biekwa ogologo ndụ ha niile nʼafọ ojuju.   
12 Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,  
ha ga-ala nʼiyi site na mma agha,  
ha ga-anwụ na-enweghị ọmụma ihe.   
   
 
13 “Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha.  
Ha adịghị echegharị kpọkuo ya ọ bụladị mgbe o kere ha agbụ.   
14 Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha,  
nʼetiti ndị ikom na-agba akwụna nʼụlọ arụsị dị iche iche.   
15 Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha;  
na-agwa ha okwu site na mkpagbu ha.   
   
 
16 “Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu,  
baa nʼebe sara mbara, ebe mkpagbu na-adịghị,  
baa na tebul nke jupụtara na nri dị ezi ụtọ.   
17 Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị;  
ikpe ọmụma na ikpe ziri ezi abịakwasịla gị.   
18 Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị;  
ekwekwala ka ihe ngarị bara ụba wezuga gị nʼọnọdụ gị.   
19 Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị  
ka ị ghara ịnọ na mkpagbu?   
20 Anọla na-echere ka abalị bịa,  
mgbe a na-adọkpụrụ ndị ụmụ mmadụ site nʼụlọ ha pụọ.   
21 Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe,  
bụ nke ọ dị ka ị na-ahọrọ karịa mkpagbu.   
   
 
22 “E buliela Chineke elu nʼike ya,  
onye bụ onye ozizi dịka ya?   
23 Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso,  
maọbụ sị ya ‘I meela ajọ ihe’?   
24 Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu,  
bụ nke ụmụ mmadụ torola site nʼabụ.   
25 Mmadụ niile ahụzuola ya;  
ụmụ mmadụ nọ nʼebe dị anya na-ele ya anya.   
26 Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị.  
Ọnụọgụgụ afọ ya karịrị mmadụ ịchọpụta.   
   
 
27 “Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha,  
nke a na-aghọ mmiri ozuzo nye iyi niile.   
28 Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya  
mee ka mmiri ozuzo dị ukwuu zokwasị ụmụ mmadụ.   
29 Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii,  
ka o si ebigbọ site nʼebe obibi ya?   
30 Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya  
na-ekpuchi ebe niile dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.   
31 Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile  
na-enyejukwa ha nri afọ.   
32 O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya,  
ma na-enye ya iwu itida ihe ọbụla ọ chọrọ.   
33 Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri;  
ọ bụladị ehi na-eme ka a mara na ọ nọ nso.