37
1 “Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji,  
na-amali elu site nʼọnọdụ ya.   
2 Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,  
na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.   
3 Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,  
ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.   
4 Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;  
ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe,  
mgbe olu ahụ dara dakwasị,  
ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.   
5 Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;  
ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.   
6 Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’  
na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’   
7 Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya;  
ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.   
8 Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe;  
ha na-anọgide nʼebe obibi ha.   
9 Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa,  
oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.   
10 Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri,  
ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.   
11 Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri;  
na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.   
12 Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu  
imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee  
nʼelu ụwa niile.   
13 Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ,  
na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.   
   
 
14 “Job, gee ntị.  
Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.   
15 Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii  
na-eme ka amụma gbuo?   
16 Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,  
nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?   
17 Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ  
mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,   
18 ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe  
nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?   
   
 
19 “Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;  
ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.   
20 A ga-agwa ya na m nwere okwu?  
Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?   
21 Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya  
ka ọ na-achake na mbara igwe,  
mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.   
22 Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;  
Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.   
23 Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu,  
nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.   
24 Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya,  
ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”