35
1 Mgbe ahụ, Elihu sịrị:   
2 “Ị na-eche na nke a ziri ezi?  
Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’   
3 Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m,  
gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’   
   
 
4 “Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị,  
zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.   
5 Lelie anya na eluigwe ma hụkwa.  
Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.   
6 Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya?  
Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?   
7 Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya,  
maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?   
8 Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị,  
ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.   
   
 
9 “Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu,  
ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.   
10 Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ,  
onye na-enye abụ nʼime abalị,   
11 onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa,  
onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’   
12 Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa,  
nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.   
13 Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha;  
Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.   
14 Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị  
mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya,  
na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya  
na ị ga-anọkwa na-eche ya!   
15 Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ,  
nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.   
16 Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe;  
ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”