32
Okwu Elihu 
 
1 Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume.  
2 Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke.  
3 Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.  
4 Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ.  
5 Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.   
6 Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị:  
“Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara,  
ma unu bụ ndị okenye;  
ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ,  
hapụ ịgwa unu ihe m maara.   
7 Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu;  
ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’   
8 Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ,  
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.   
9 Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe,  
ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.   
   
 
10 “Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị;  
mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.   
11 Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu,  
egere m ntị na ntụgharị uche unu,  
oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.   
12 Egere m nnọọ unu ntị,  
ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie;  
ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.   
13 Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe;  
ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’   
14 Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m,  
ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.   
   
 
15 “Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu;  
ike okwu agwụla ha.   
16 M ga-echere, ugbu a ha deere duu,  
ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?   
17 Mụ onwe m ga-ekwu uche m;  
ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,   
18 nʼihi na okwu juru m ọnụ,  
ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.   
19 Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama,  
dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.   
20 Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike;  
aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.   
21 Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide  
maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.   
22 Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma,  
Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.