33
1 “Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m;  
ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu.   
2 Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu;  
okwu m dịkwa nʼọnụ ire m.   
3 Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;  
egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma.   
4 Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,  
nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ.   
5 Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;  
jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka.   
6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;  
mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo.   
7 Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,  
ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị.   
   
 
8 “Ma ị kwuola ya na ntị m,  
anụrụ m okwu ndị ahụ niile,   
9 ‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere;  
adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla.   
10 Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ;  
ọ na-ahụta m dịka onye iro ya.   
11 Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ;  
ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’   
   
 
12 “Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma,  
nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ.   
13 Gịnị mere i ji na-ekpesara ya  
na ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu?   
14 Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,  
ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya.   
15 Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,  
mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra,  
mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha.   
16 O nwere ike kwunye ha okwu na ntị  
ma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị;   
17 ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,  
ka o si na nganga ya wezuga onwe ya,   
18 ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,  
chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha.   
   
 
19 “Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,  
ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu.   
20 Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,  
ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ.   
21 Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,  
ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a.   
22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,  
ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi.   
23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,  
dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ,  
onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya,   
24 ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,  
‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili;  
achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya.   
25 Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,  
ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’   
26 Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,  
ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,  
ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya.   
27 Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:  
‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume,  
ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m;   
28 ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,  
ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’   
   
 
29 “Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ  
ugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ.   
30 Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,  
ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya.   
   
 
31 “Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m;  
dere jii ka m kwuo okwu.   
32 Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m;  
kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume.   
33 Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị;  
dere jii, ka m zi gị amamihe.”