31
1 “Mụ na anya m gbara ndụ kpebie  
na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.   
2 Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu;  
gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?   
3 Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume,  
nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?   
4 Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile,  
gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?   
   
 
5 “Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha  
maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,   
6 ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m,  
ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.   
7 Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya,  
ọ bụrụ anya m na-edu obi m,  
ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,   
8 ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi,  
ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.   
   
 
9 “Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ,  
maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,   
10 mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri,  
ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.   
11 Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere,  
bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.   
12 Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi;  
nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.   
   
 
13 “Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi  
nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi  
mgbe ha nwere mkpesa megide m,   
14 gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m?  
Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?   
15 Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?  
Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?   
   
 
16 “Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,  
ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,   
17 ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,  
ma jụ inye ya ụmụ mgbei;   
18 ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,  
ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.   
19 Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,  
maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,   
20 ma obi ha agọzighị m  
nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.   
21 Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ,  
nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,   
22 mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ,  
ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.   
23 Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke,  
nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.   
   
 
24 “Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo,  
maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’   
25 Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m,  
ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,   
26 ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya,  
maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,   
27 nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo,  
maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,   
28 mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe,  
nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.   
   
 
29 “Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m  
maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,   
30 ekwebeghị m ka ọnụ m mehie  
megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.   
31 Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị.  
‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’   
32 Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama,  
nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.   
33 Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,  
site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,   
34 nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,  
si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche,  
nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.   
   
 
35 (“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!  
Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m,  
ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.   
36 Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,  
aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.   
37 Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,  
aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)   
   
 
38 “Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m,  
ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,   
39 ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ,  
maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,   
40 ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti,  
ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.”  
Okwu Job agwụla.