30
1 “Ma ugbu a, ha na-akwa m emo  
bụ ndị bụ ụmụntakịrị nʼebe m nọ,  
bụ ndị nna ha na-etorughị ndị m na-ezipụ  
ka ha na nkịta na-eso atụrụ m nọkọta.   
2 Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m,  
ebe ọ bụ na ha adịghịkwa ike?   
3 Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,  
ha na-agagharị nʼala kpọrọ nkụ  
na-awagharịkwa nʼime ọzara nʼabalị.   
4 Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,  
mgbọrọgwụ osisi brum bụkwa nri ha.   
5 A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,  
a na-etiso ha mkpu dịka ha bụ ndị ohi.   
6 A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.  
Ha bi nʼetiti ọgba nkume na ọnụ a tụrụ nʼime ala.   
7 Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ,  
na-ejikọta onwe ha nʼahịhịa toro nʼokpuru osisi.   
8 Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha,  
e sitere nʼala ahụ chụpụ ha.   
   
 
9 “Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo;  
abụrụkwala m okwu ha ji anọpụrụ ụbọchị.   
10 Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso;  
ha anaghị egbu oge igbu m asọ mmiri nʼihu.   
11 Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m,  
o nwekwaghị ihe ha na-adịghị eme nʼihu m.   
12 Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.  
Ha na-esiri ụkwụ m ọnya,  
ha na-ewuli mgbidi ha nọchibido m.   
13 Ha na-etiwasị ụzọ m,  
ha kwadoro mmekpa ahụ m.  
‘O nweghị onye ga-enyere ya aka,’ ka ha na-ekwu.   
14 Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;  
nʼetiti mbibi ya ha na-enu onwe ha enute nʼebe m nọ.   
15 Oke egwu abịakwasịla m;  
ugwu m adịla ka ihe ifufe buuru,  
nchekwa m agabigala dịka igwe ojii.   
   
 
16 “Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga;  
ụbọchị ahụhụ ejidela m.   
17 Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m,  
ihe mgbu m nke na-ata ata enweghị ezumike.   
18 Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe;  
ọ na-ekechi m dịka olu uwe m.   
19 Ọ na-atụba m nʼime apịtị,  
mee ka m ghọọ ntụ na aja.   
   
 
20 “Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m;  
anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m.   
21 Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere;  
i ji aka gị dị ike megide m.   
22 Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe,  
ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri.   
23 Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ;  
ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ.   
   
 
24 “Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala;  
mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka.   
25 Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu;  
ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye?   
26 Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara;  
mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara.   
27 Obi m anaghị ezu ike nʼime m;  
ụbọchị ahụhụ na-ezute m.   
28 Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ.  
Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka.   
29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa;  
onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị.   
30 Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere;  
anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ.   
31 Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ;  
ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.