29
Ngọpụ ikpeazụ Job 
 
1 Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:   
2 “Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga,  
dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,   
3 mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi  
ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.   
4 Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,  
mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,   
5 mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m  
na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,   
6 mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,  
mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.   
   
 
7 “Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo  
were ọnọdụ m nʼama.   
8 Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha,  
ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;   
9 ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu  
ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;   
10 olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ,  
ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.   
11 Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,  
ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.   
12 Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,  
napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.   
13 Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;  
emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.   
14 Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,  
ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.   
15 Abụ m anya nye onye ìsì,  
bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.   
16 Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;  
bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.   
17 Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,  
si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.   
   
 
18 “Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,  
na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.   
19 Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,  
na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.   
20 Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,  
ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’   
   
 
21 “Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị,  
ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.   
22 Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ.  
Okwu m na-ada juu na ntị ha.   
23 Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo,  
na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.   
24 Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya;  
ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.   
25 Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha;  
ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya;  
na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.