28
Nwa mgbe nta: Ebe a na-achọta amamihe 
 
1 Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị;  
ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.   
2 E si nʼime ala ewepụta igwe,  
ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.   
3 Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ;  
ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya,  
na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.   
4 Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi,  
nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru,  
nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.   
5 Ala ahụ e si na ya enweta nri,  
abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.   
6 Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya;  
aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.   
7 Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo;  
anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.   
8 Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya,  
ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.   
9 Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ  
mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.   
10 Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ,  
anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.   
11 Ha na-achọpụta isi mmiri niile  
ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.   
   
 
12 Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe?  
Olee kwa ebe nghọta bi?   
13 Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya,  
agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.   
14 Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,”  
osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”   
15 A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya,  
apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.   
16 A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya,  
a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,   
17 A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya,  
maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.   
18 Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị;  
ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.   
19 A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya;  
a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.   
   
 
20 Olee ebe amamihe si abịa?  
Olee ebe nghọta bi?   
21 E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ,  
e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.   
22 Mbibi na ọnwụ na-asị;  
“Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”   
23 Chineke ghọtara ụzọ ya,  
naanị ya makwara ebe obibi ya dị.   
24 Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa,  
na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.   
25 Mgbe o hiwere ike nke ikuku,  
tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,   
26 mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu  
meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,   
27 mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya,  
meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.   
28 Ọ sịrị mmadụ,  
“Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe;  
ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”