27
Okwu ikpeazụ Job nye ndị enyi ya 
 
1 Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:   
2 “Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,  
Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.   
3 Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,  
mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,   
4 egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,  
ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.   
5 Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;  
ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.   
6 Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;  
o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.   
   
 
7 “Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,  
ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.   
8 Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,  
mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?   
9 Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya  
mgbe nsogbu dakwasịrị ya?   
10 Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?  
Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?   
   
 
11 “Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;  
agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.   
12 Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,  
gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?   
   
 
13 “Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,  
nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.   
14 Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;  
ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.   
15 Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;  
ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.   
16 Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,  
ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,   
17 ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,  
ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.   
18 Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,  
dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.   
19 Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;  
mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.   
20 Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;  
oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.   
21 Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;  
ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.   
22 Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere  
mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.   
23 Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,  
were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”