19
Okwu Job 
 
1 Job zara sị:   
2 “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ?  
Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m?   
3 Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m,  
ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha?   
4 A sịkwarị na m bụ onye mmehie,  
ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara.   
5 Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m,  
ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m,   
6 mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m,  
were ụgbụ ya tụọ m gburugburu.   
   
 
7 “Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata;  
ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị.   
8 Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe;  
o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m.   
9 O yipụla m ugwu m,  
wepụkwa okpueze m kpu nʼisi.   
10 Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara;  
ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi.   
11 Iwe ya dị ọkụ megide m;  
ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya.   
12 Ndị agha ya ji ike na-abịa;  
ha ewuola mgbidi were nnọchibido m  
ha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m.   
   
 
13 “O meela ka ụmụnne m  
na ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ.   
14 Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m;  
ndị ezi enyi m niile echefuola m.   
15 Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ;  
adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ.   
16 Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m,  
ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya.   
17 Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide;  
abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m.   
18 Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo;  
ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara.   
19 Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ;  
ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m   
20 Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ;  
ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu.   
   
 
21 “Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere,  
nʼihi na aka Chineke na-emegide m.   
22 Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m?  
Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ?   
   
 
23 “Ọ gaara atọ m ụtọ  
ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ,   
24 na e ji mkpisi igwe dee ha,  
maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi.   
25 Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ,  
amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.   
26 Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m,  
ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke.   
27 Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya,  
mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ.  
Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!   
   
 
28 “Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya  
nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’   
29 unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha;  
nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha,  
mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị.”