20
Okwu Zofa 
 
1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:   
2 “Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi  
nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.   
3 Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,  
ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.   
   
 
4 “Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie,  
ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.   
5 Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,  
ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.   
6 Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,  
na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;   
7 ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;  
ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’   
8 Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,  
dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.   
9 Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,  
ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.   
10 Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;  
aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.   
11 Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa  
ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.   
   
 
12 “Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,  
na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;   
13 ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya,  
ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,   
14 ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,  
ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.   
15 Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;  
Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.   
16 Ọ ga-amịcha elo agwọ,  
eze agwọ ajụala ga-egbu ya.   
17 Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,  
bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.   
18 Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.  
Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.   
19 Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,  
ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.   
   
 
20 “Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;  
ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.   
21 Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,  
ọganihu ya agaghị adịgide.   
22 Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,  
oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.   
23 Mgbe o rijuru afọ  
ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,  
iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.   
24 Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,  
àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.   
25 Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,  
site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma.  
Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.   
26 Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,  
ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya  
ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.   
27 Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya  
ụwa niile ga-ebili megide ya.   
28 Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;  
oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.   
29 Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,  
ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”