18
Okwu Bildad 
 
1 Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:   
2 “Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu?  
Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.   
3 Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa,  
gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?   
4 Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị,  
a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị?  
Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?   
   
 
5 “A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu;  
ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,   
6 ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị,  
oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.   
7 Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya;  
atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.   
8 Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya;  
ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.   
9 Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya,  
ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.   
10 E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala,  
ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.   
11 Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile,  
na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.   
12 Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike;  
mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.   
13 Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya;  
ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.   
14 Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya  
duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.   
15 Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya;  
a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.   
16 Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala,  
alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.   
17 A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ,  
o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.   
18 A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị,  
otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.   
19 O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya,  
ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.   
20 Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya;  
oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.   
21 Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị,  
ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”