17
1 Mmụọ m tiwara etiwa,  
ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ,  
ili na-echere ịnabata m.   
2 Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;  
anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.   
   
 
3 “Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.  
Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?   
4 I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;  
ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.   
5 Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,  
anya ụmụ ya ga-ada mba.   
   
 
6 “Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,  
meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.   
7 Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;  
ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.   
8 Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;  
ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.   
9 Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,  
ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.   
   
 
10 “Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!  
Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.   
11 Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi.  
Ma ọchịchọ nke obi m   
12 na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie;  
nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.   
13 Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili,  
ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,   
14 a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’  
maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’   
15 ebeekwa ka olileanya m dị?  
Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?   
16 Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ?  
Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”