16
Okwu Job 
 
1 Mgbe ahụ, Job zara sị:   
2 “Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a;  
ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.   
3 Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị?  
Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?   
4 Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu,  
ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m;  
enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu,  
ma fufekwaa isi m megide unu.   
5 Ma ọnụ m ga-agba unu ume;  
nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.   
   
 
6 “Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m,  
ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?   
7 Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m,  
i tidakwala ezinaụlọ m.   
8 I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;  
ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.   
9 Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,  
ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m;  
onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.   
10 Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,  
ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,  
jikọtakwa onwe ha megide m.   
11 Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,  
tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.   
12 Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.  
O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.  
O meela m ihe ịgba ụta ya;   
13 ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.  
Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko  
mee ka oluilu m wụsịa nʼala.   
14 Mgbe niile, ọ na-emegide m;  
ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.   
   
 
15 “Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m,  
liekwa ikuanya m nʼime ntụ.   
16 Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa,  
onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;   
17 ma aka m emeghị ihe ike ọbụla,  
ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.   
   
 
18 “Ala, biko, ezokwala ọbara m;  
mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!   
19 Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe,  
onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.   
20 Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m,  
dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.   
21 Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke  
dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.   
   
 
22 “Naanị afọ ole na ole ga-agabiga  
tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.