13
1 “Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile,  
ntị m anụla ma ghọtakwa ha.   
2 Mụ onwe m makwa ihe unu maara;  
abụghị m onye dị ala nʼebe unu nọ.   
3 Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu,  
ka mụ na Chineke rụọkwa ụka banyere okwu m.   
4 Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;  
unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.   
5 Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,  
nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.   
6 Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m;  
geekwanụ ntị nụrụ okwu si m nʼọnụ na-apụta.   
7 Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide?  
Unu ga-esite nʼokwu aghụghọ kwuchitere Chineke ọnụ ya?   
8 Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe?  
Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?   
9 Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu?  
Unu pụrụ ịghọgbu ya dịka unu si aghọgbu ndị mmadụ?   
10 Ọ ghaghị ịbara unu mba  
ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.   
11 Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji?  
Egwu ya ọ dịghị atụ unu?   
12 Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ;  
okwu ngọpụ unu dịka ihe ngọpụ ụrọ.   
   
 
13 “Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu;  
ihe ọ pụtara ya pụta.   
14 Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu,  
werekwa ndụ m tinye nʼọbụaka m?   
15 A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m.  
Aga m ekwuchite ọnụ m gwa ya na ụzọ m dị ọcha.   
16 Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta  
maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.   
17 Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m.  
Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.   
18 Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro,  
amatala m na ikpe agaghị ama m.   
19 Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo?  
Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.   
   
 
20 “Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke,  
mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.   
21 Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ.  
Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji.   
22 Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị.  
Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m.   
23 Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere?  
Gosi m ajọ omume m na mmehie m.   
24 Gịnị mere i ji gbakụta m azụ?  
Gịnị mere i ji gụọ m dịka onye iro gị?   
25 Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ?  
Ị ga-achụ ahịhịa kpọrọ nkụ ọsọ?   
26 Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m,  
na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.   
27 Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ;  
na-enyochakwa nzọ ụkwụ m niile  
site nʼitinye akara nʼebe ọbụla ọbụ ụkwụ m zọrọ.   
   
 
28 “Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere,  
na dịka akwa nke nla riri.