12
Okwu Job 
 
1 Mgbe ahụ, Job zara:   
2 “Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe,  
unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.   
3 Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;  
abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ.  
Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?   
   
 
4 “Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,  
nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za,  
onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!   
5 Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya  
dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.   
6 Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;  
ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo,  
bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.   
   
 
7 “Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị,  
maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.   
8 Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị,  
maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.   
9 Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị  
na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?   
10 Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị,  
ya na ndụ ụmụ mmadụ   
11 Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu,  
otu ire si anwale ihe oriri?   
12 Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye?  
Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?   
   
 
13 “Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike,  
ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.   
14 Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ;  
mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.   
15 Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa.  
Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.   
16 Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị;  
ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.   
17 Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha,  
ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.   
18 Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere,  
ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.   
19 Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha,  
kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.   
20 Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi,  
wepụkwa nghọta nke ndị okenye.   
21 Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị,  
napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.   
22 Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị  
meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.   
23 Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi;  
Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.   
24 Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha,  
zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.   
25 Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè.  
Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.