11
Okwu Zofa 
 
1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:   
2 “Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a?  
A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?   
3 Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị?  
Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?   
4 Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ,  
adịkwa m ọcha nʼanya gị.’   
5 Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu,  
na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.   
6 Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe,  
nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ.  
Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.   
   
 
7 “I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke?  
I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?   
8 Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime?  
Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma?   
9 Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa,  
dị obosara karịa oke osimiri.   
   
 
10 “Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ,  
kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?   
11 Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie,  
mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?   
12 Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe  
naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.   
   
 
13 “Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya,  
setịpụ aka gị abụọ nye ya,   
14 ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka,  
ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị   
15 mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị,  
ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.   
16 Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị,  
na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.   
17 Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie,  
ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.   
18 Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị;  
ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.   
19 Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla,  
ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.   
20 Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada,  
ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ;  
olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”