10
1 “Ike ịdị ndụ agwụla m.  
Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi,  
kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.   
2 Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe,  
kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.   
3 Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m,  
si otu a leda ọrụ aka gị anya,  
mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?   
4 Ị nwere anya nke anụ ahụ?  
Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?   
5 Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ,  
ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?   
6 Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m  
ma nyochaa mmehie m?   
7 Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m,  
na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.   
   
 
8 “Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m.  
Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?   
9 Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ.  
Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?   
10 Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi  
mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?   
11 Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ,  
werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?   
12 I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,  
nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.   
   
 
13 “Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,  
amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.   
14 Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,  
ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.   
15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!  
A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu  
nʼihi na ejupụtara m nʼihere,  
bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.   
16 Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ  
ma werekwa ike gị dị egwu megide m.   
17 I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,  
mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ;  
ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.   
   
 
18 “Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?  
Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.   
19 A sịkwarị na amụpụtaghị m  
maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!   
20 Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole?  
Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,   
21 tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ  
ebe m na-agaghị esi pụtakwa.   
22 Nʼala nke oke ọchịchịrị,  
ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị,  
ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”