14
1 “Mmadụ nke nwanyị mụrụ  
nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.   
2 Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya,  
dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.   
3 Ị na-elegide onye dị otu a anya?  
Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?   
4 Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha?  
Ọ dịghị onye ọ bụ.   
5 Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ;  
ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile,  
kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.   
6 Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya  
ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.   
   
 
7 “Ma olileanya dịịrị osisi;  
nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa,  
alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.   
8 A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala,  
maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,   
9 mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya,  
ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.   
10 Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya;  
ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.   
11 Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata,  
maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,   
12 otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ;  
tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya,  
agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.   
   
 
13 “A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ,  
na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara.  
A sị na ị ga-akanyere m oge  
ma mesịa cheta m.   
14 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ?  
Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m,  
aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.   
15 Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị,  
agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.   
16 Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ,  
ma ị gaghị agụkọ mmehie m.   
17 A ga-ekechi njehie m nʼakpa,  
ị ga-ekpuchi mmehie m.   
   
 
18 “Ma dịka ugwu si erichasi daa,  
na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,   
19 dịka mmiri si akwọchasị nkume,  
na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala,  
otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.   
20 Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga;  
ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.   
21 Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a;  
ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.   
22 Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama  
ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”