40
Onyenwe anyị zara Job sị:
“Onye ahụ na-arụso Onye pụrụ ime ihe niile ụka ọ pụrụ ịdọ ya aka na ntị?
Ka onye ahụ na-ebo Chineke ebubo zaghachi ya.”
Mgbe ahụ, Job zaghachiri Onyenwe anyị sị:
“Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị?
Eji m aka m kpuchie ọnụ m.
Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ
kwuokwa ugboro abụọ, ma agaghị m ekwukwa ọzọ.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
“Kwadoo onwe gị dịka dimkpa;
enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị,
achọkwara m ka i nye m ọsịsa.
 
“Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m?
Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara?
Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke?
Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya?
10 Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma,
yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe.
11 Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ,
weda ha nʼala,
12 lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere,
ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo.
13 Likọta ha niile nʼotu nʼaja,
kpuchie ihu ha niile nʼala ili.
14 Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị,
na aka nri nwere ike ịzọpụta gị.
 
15 “Lee enyi mmiri anya,
bụ nke m kere dịka m si kee gị,
ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi.
16 Lee ike dị nʼukwu ya,
leekwa ike dị nʼime afọ ya.
17 Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida;
akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma.
18 Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị,
ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe.
19 Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke,
ma naanị onye kere ya nwere ike iji mma agha bịa ya nso.
20 Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri.
Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu.
21 Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri,
zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị.
22 Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya,
osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu.
23 Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu;
ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ.
24 Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya,
maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?