39
1 “Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa?  
O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?   
2 Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha.  
Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?   
3 Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha.  
Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.   
4 Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike.  
Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.   
   
 
5 “Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya?  
Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?   
6 Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha,  
ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.   
7 Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya,  
ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.   
8 Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya,  
ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.   
   
 
9 “Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi?  
Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?   
10 Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị?  
Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?   
11 Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne?  
Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?   
12 I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka  
site nʼebe ịzọcha ọka gị?   
   
 
13 “Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya,  
ma a pụghị iji nku ya tụnyere  
nku na abụba nke ụgbala.   
14 Ọ na-eyi akwa ya nʼala  
ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.   
15 Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha  
maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.   
16 Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya,  
ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.   
17 Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe  
maọbụ kenye ya oke na inwe uche.   
18 Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ,  
ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.   
   
 
19 “Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya,  
ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?   
20 Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube,  
were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?   
21 Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya,  
ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.   
22 Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya;  
ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.   
23 Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya,  
ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.   
24 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala.  
Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.   
25 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’  
Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha.  
Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.   
   
 
26 “Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu,  
gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?   
27 Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu  
ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?   
28 Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị;  
ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.   
29 O bụ site nʼebe ahụ  
ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.   
30 Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara,  
nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”