28
1 Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha,  
ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.   
   
 
2 Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi,  
ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.   
   
 
3 Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye,  
bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.   
   
 
4 Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume,  
ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.   
   
 
5 Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara,  
ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.   
   
 
6 Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu  
karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.   
   
 
7 Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru,  
ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.   
   
 
8 Onye na-eme ka akụ ya baa ụba site na ịnara ụma maọbụ ọmụrụnwa nʼaka onye ogbenye,  
na-ekpokọta ya nye onye ọzọ, onye na-emere ndị ogbenye ebere.   
   
 
9 Onye na-ewezuga ntị ya site nʼebe iwu m dị,  
ọ bụladị ekpere ha bụ ihe arụ.   
   
 
10 Onye ọbụla na-eduhie ndị ziri ezi nʼụzọ ihe ọjọọ,  
ga-adaba nʼọnya ahụ ha onwe ha gbara,  
ma ndị na-enweghị ịta ụta ga-anata ezi ihe nketa.   
   
 
11 Nʼanya nke onwe ya, onye ọgaranya na-agụ onwe ya dịka onye maara ihe,  
ma nʼezie, onye ogbenye nwere nghọta na-enyochapụta amaghị ihe nke onye ọgaranya.   
   
 
12 Mgbe ihe na-agara ndị ezi omume nke ọma, onye ọbụla na-aṅụrị ọṅụ,  
ma onye ọbụla na-ezo onwe ya mgbe onye na-emebi iwu na-aga nʼihu.   
   
 
13 Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya.  
Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.   
   
 
14 Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke,  
ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.   
   
 
15 Dịka ọdụm na-agbọ ụja maọbụ nne bịa na-achụ mmadụ  
otu a ka onye ọchịchị ọjọọ nke na-achị ndị na-enweghị ike dị.   
   
 
16 Ọ bụ naanị eze na-amaghị ihe ga-akpagbu ndị ya;  
ma eze ga-achị ogologo oge bụ eze kpọrọ iri ngarị asị.   
   
 
17 Obi ogbu mmadụ ga na-ama ya ikpe  
ruo ala mmụọ.  
Ka onye ọbụla ghara inyere ya aka.   
   
 
18 Onye na-eje ije na-enweghị ịta ụta ka a na-echebe,  
ma onye ụzọ ya gbagọrọ agbagọ ga-adaba nʼolulu.   
   
 
19 Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba,  
ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, ụbịam ga-eju ya afọ.   
   
 
20 Onye ọbụla nke kwesiri ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzị,  
ma nwoke ahụ na-achọ ịbụ ọgaranya ngwangwa aghaghị inweta ntaramahụhụ.   
   
 
21 Ile mmadụ anya nʼihu nʼoge ikpe jọgburu onwe ya.  
Ma ụfọdụ ndị ikpe na-eme ihe na-ezighị ezi, ọ bụladị, nʼihi iberibe nri.   
   
 
22 Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya  
amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.   
   
 
23 Onye ọbụla na-abara mmadụ mba, nʼikpeazụ ga-enweta amara  
karịa onye ahụ na-aja mmadụ ibe ya mma ire ụtọ.   
   
 
24 Nwoke na-ezu nne na nna ya ohi ma na-asịkwa,  
“Olee ihe ọjọọ dị na ya?”  
Onye dị otu a bụ nnọọ enyi ndị mbibi.   
   
 
25 Ndị oke ọchịchọ na-akpali ise okwu,  
ma ndị na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-enwe ọganihu.   
   
 
26 Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu!  
Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.   
   
 
27 Ọ bụrụ na i nye ogbenye, a ga-egboro gị mkpa gị.  
Ma ọbụbụ ọnụ dịrị ndị ahụ na-ekpuchi anya ha nʼebe ndị ogbenye nọ.   
   
 
28 Mgbe ndị ajọ omume na-aga nʼihu, ndị ezi omume na-ezo onwe ha,  
ma mgbe ha nʼala nʼiyi, ndị ezi omume nʼaba ụba.