Ilu ndị ọzọ nke Solomọn  
25
1 Ndị a bụkwa ilu Solomọn, nke ndị ozi Hezekaya eze ndị Juda dekọtara nʼakwụkwọ.   
2 Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu,  
ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.   
3 Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala,  
otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.   
   
 
4 Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha,  
onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;   
5 wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze,  
ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.   
   
 
6 Egosipụtala onwe gị nʼihu eze,  
ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,   
7 ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,”  
karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ.  
   
 
Ihe iji anya gị abụọ hụ   
8 e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe,  
nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ  
ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?   
   
 
9 Ọ bụrụ na gị na onye ọzọ enwee esemokwu, dozienụ ya nʼonwe unu,  
emekwala ka ndị ọzọ mata okwu nzuzo gị na onye ọzọ kwuru,   
10 ma ọ bụghị ya, onye nụrụ ya nwere ike menye gị ihere,  
agwa ọjọọ gị agaghị enwekwa ọgwụgwụ.   
   
 
11 Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi  
dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha.   
12 Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma  
ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.   
   
 
13 Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ,  
dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ  
nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.   
14 Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere  
dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.   
   
 
15 Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri,  
nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.   
   
 
16 Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ?  
Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.   
17 Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe,  
ka ị ghara ire ugwu gị.   
   
 
18 Onye na-agbagịde onye agbataobi ya ama ụgha,  
dịka mkpọrọ osisi maọbụ mma agha, maọbụ àkụ a pịziri apịzi.   
19 Ịtụkwasị onye aghụghọ obi nʼoge nsogbu dị ka iji eze na-eme ndakapụ ata ihe,  
maọbụ iji ụkwụ jiri eji agba ọsọ.   
20 Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ,  
maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya,  
otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.   
   
 
21 Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie,  
ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.   
22 Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya,  
Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.   
   
 
23 Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo,  
otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.   
   
 
24 Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ  
karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.   
   
 
25 Oziọma e sitere na mba dị anya nata  
dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.   
26 Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru  
dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.   
   
 
27 Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ,  
otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.   
   
 
28 Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya  
dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.