4
Okwu Elifaz 
 
1 Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:   
2 “Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?  
Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?   
3 Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,  
na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.   
4 Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,  
ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.   
5 Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;  
nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.   
6 Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,  
izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?   
   
 
7 “Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?  
Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?   
8 Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka  
na-aghọta ya dịka ihe ubi.   
9 Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta.  
Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.   
10 Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,  
ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.   
11 Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara,  
ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.   
   
 
12 “E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,  
ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.   
13 Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,  
mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,   
14 oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,  
meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.   
15 Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.  
Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.   
16 Ọ kwụsịrị;  
ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ.  
Onyinyo guzooro nʼanya m,  
anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:   
17 ‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?  
Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?   
18 Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,  
ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,   
19 ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,  
bụ ndị ntọala ha dị nʼaja,  
ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.   
20 Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:  
ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.   
21 Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,  
mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’