25
Okwu Bildad 
 
1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:   
2 “Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;  
Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.   
3 Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?  
Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?   
4 Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?  
Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?   
5 Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,  
ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,   
6 ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,  
mmadụ, nke bụ naanị idide.”