23
Okwu Job 
 
1 Mgbe ahụ, Job zara sị:   
2 “Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu;  
aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.   
3 A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya;  
a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!   
4 Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya  
were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.   
5 Aga m achọpụta ihe o ga-aza m  
ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.   
6 Ọ ga-eji ike dị egwu megide m?  
Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.   
7 Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya.  
Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.   
   
 
8 “Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ;  
ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.   
9 Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya,  
mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.   
10 Ma ọ maara ụzọ m na-aga,  
mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,   
11 ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya;  
ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.   
12 Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m;  
a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.   
   
 
13 “Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya?  
Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.   
14 Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m,  
ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.   
15 Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya;  
mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.   
16 Chineke emeela ka obi m daa mba;  
Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.   
17 Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m,  
bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.