28
Ahụhụ dịrị ndịisi Ifrem na Juda
Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko* ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem,
obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi.
Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma.
Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi.
Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike, onye nwekwara ume,
dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi,
dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo,
ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala.
Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke,
ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ.
Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya,
nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe,
ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo,
nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka,
tinye nʼọnụ ya, loo ha.
 
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya,
ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụ
okpueze mara mma,
ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma.
Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi
nye ndị ikpe.
Ọ ga-abụkwa ike
nye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama.
 
Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya
sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya.
Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya,
mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme;
ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya
ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche,
ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.
Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi.
O nwekwaghị ebe dị ọcha.
 
“Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe?
Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya?
Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara,
bụ ndị a ka napụrụ ara?
10 Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya,
ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ,
nʼusoro tụkwasị nʼusoro,
nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.”
 
11 Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị
zi unu ihe.
12 Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị,
“Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike;
nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.”
Ma ha jụrụ ige ya ntị.
13 Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị
nʼahịrị nʼahịrị,
nʼusoro nʼusoro;
nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ,
ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ,
ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.
 
14 Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo,
ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka.
15 Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ,
anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi.
Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee,
ọ gaghị erute anyị,
nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị;
ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.”
16 Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke anwapụtarala.
Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike.
Onye nke kweere na ya
egwu agaghị ejide ya.§
17 Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe,
ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi;
akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu,
mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu.
18 Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara;
mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa.
Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe,
ọ ga-azọda unu.
19 Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu,
maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị,
oge niile, mgbe mgbe.”
 
Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke;
ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.
20 Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya;
akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma.
21 Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim,
ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn,
ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa,
na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.
22 Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo,
ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa.
Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi.
 
23 Geenụ ntị, nụrụnụ olu m,
ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu.
24 Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ?
Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla?
25 Mgbe o gwuzesịrị ya,
ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin?
Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya,
ọka balị nʼebe o kwesiri,
na spelti nʼebe o kwesiri?
26 Ọ maara ihe o kwesiri ime,
nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi.
 
27 Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe,
maọbụ kpọree ụkwụ igwe* nʼelu kumin,
kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin,
werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe.
28 A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ,
ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya.
E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha,
ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha.
29 Ihe ndị a niile na-esite nʼaka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa,
onye nzube ya dị ịtụnanya,
onye amamihe ya dị ebube.
* 28:1 Okpueze okoko nʼebe a, na-ekwu banyere obodo Sameria. 28:2 Nʼebe a otu onye ahụ dị ike bụ eze ndị Asịrịa. 28:16 Onye ọbụla na-ewukwasị ndụ ya nʼelu ya agaghị enwe ihe egwu ọbụla; § 28:16 Agaghị eme ọsịịsọ laghachi azụ. * 28:27 Lit. wịịlu