6
Nnọgide na nnupu isi Izrel 
 
1 “Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị.  
Ya onwe ya adọkaala anyị,  
ọ ga-agwọkwa anyị;  
o tipụla anyị ọnya,  
ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.   
2 Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.  
Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,  
meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.   
3 Ka anyị mara Onyenwe anyị;  
ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.  
Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,  
nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,  
ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,  
dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”   
   
 
4 “Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?  
Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?  
Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,  
dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.   
5 Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.  
Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,  
ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.   
6 Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja,  
ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.   
7 Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m;  
nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.   
8 Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe,  
nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.   
9 Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe,  
otu a ka ndị nchụaja  
si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem,  
leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.   
10 Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel.  
Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna,  
emerụọkwala Izrel.   
   
 
11 “Ma nye gị onwe gị, Juda,  
owuwe ihe ubi nọ na-eche gị.  
   
 
“Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,