2
1 “Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’   
Ntaramahụhụ na nlọta 
 
2 “Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,  
nʼihi na ọ bụghị nwunye m,  
mụ onwe m abụkwaghị di ya.  
Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,  
ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.   
3 Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,  
aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.  
Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara,  
ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,  
were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.   
4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,  
nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko.   
5 Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,  
ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.  
Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,  
ndị na-enye m nri na mmiri,  
ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’   
6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;  
aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje.   
7 Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha.  
Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha.  
Mgbe ahụ, ọ ga-asị,  
‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m,  
nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’   
8 Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,  
na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,  
na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile  
nke o ji na-efe Baal.   
   
 
9 “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,  
na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.  
Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,  
nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.   
10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya  
nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,  
ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.   
11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;  
ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,  
nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.   
12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,  
nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;  
aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,  
anụ ọhịa ga-eripịa ha.   
13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile  
bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,  
ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,  
pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,  
ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.   
   
 
14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya,  
duba ya nʼime ọzara,  
jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ.   
15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya,  
gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya.  
Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa,  
nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta.   
   
 
16 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,  
“Ị ga-akpọ m ‘Di m,’  
ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ.   
17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,  
ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ.   
18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,  
meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ,  
na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ.  
Aga m emebi ngwa agha niile,  
agha niile ga-akwụsịkwa.  
Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ.   
19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;  
aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,  
nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere.   
20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.  
Ị ga-amatakwa Onyenwe anyị.   
   
 
21 “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,”  
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.  
“M ga-azaghachi eluigwe,  
ha ga-azaghachi ala.   
22 Ala ga-azaghachi ọka  
na mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv,  
mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril.   
23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ.  
Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’  
M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,’ ‘Unu bụ ndị nke m,’  
Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”