6
Ọ dị ihe ọjọọ ọzọ nke m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, nke na-anyịdo ụmụ mmadụ. Chineke na-enye mmadụ akụnụba, na ihe nnweta, na nsọpụrụ, na-emekwa ka ha nwee ihe niile ha chọrọ, ma ọ dịghị enye ha ike ịnụ ụtọ ha; ma onye ọzọ na-anụ ụtọ ha. Nke a bụ ihe efu, bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya.
Mmadụ nwere ike mụta narị ụmụ, o nwekwara ike nwee ndụ ogologo ruo agadi, ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịnụ ụtọ akụnụba ya, ọ bụrụkwa na o nwetaghị ụdị olili ruru ya, ana m asị, na nwa nwụrụ nʼafọ* dị mma karịa ya. Ọbịbịa ya e nweghị isi, nʼọchịchịrị ka ọ na-ala, ọ bụkwa ọchịchịrị ka e kpuchiri aha ya. Ọ bụ ezie na ọ gaghị ahụ ihe anwụ anya, ọ makwaghị ihe ọbụla, o nwere izuike karịa nwoke ahụ. A sịkwarị na o biri ndụ puku afọ, okpukpu abụọ, ma ọ nụghị ụtọ akụnụba ya. Ọ bụghị nʼotu ebe ka ha niile na-ala?
Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ,
ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya.
Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu?
Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenye
na ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?
Ihe eji anya hụ
ka mma karịa oke ọchịchọ!
Nke a bụkwa ihe efu
na ịchụso ifufe.
 
10 Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga.
Amakwaara ihe mmadụ bụ,
mmadụ ọbụla apụghị ịlụso
onye ka ya ike ọgụ.
11 Okwu na-aba ụba,
nghọta na-adị nta.
O nwere uru nke a bara?
12 Onye mara ihe dịrị mmadụ mma na ndụ, nʼụbọchị ole na ole nke na-abaghị uru o nwere ịgabiga ndụ a dịka onyinyo? Onye pụrụ ịgwa ya ihe ga-eme nʼokpuru anyanwụ, mgbe ọ nwụsịrị?
* 6:3 Maọbụ, a mụkworo amụkwo 6:7 Ilu 16:26 6:8 Maọbụ, nʼebe ndị ọzọ nọ